Mafee na isi ọdịnaya

Gini bu ether (ETH)?

Ego akwụkwọ maka dijitalụ ọdịnihu anyị

ETH dị dijitaalụ, ego mba ụwa niile.

Nke a bụ ego akwụkwọ nke ngwa Ethereum.

Ọnụ ego ETH dị ugbu a (USD)

Na-ebipute...
(Awa 24 gara)
Nweta ETH
Ihe ime atụ nke otu ndị mmadụ na-enwe ojuju anya na ether (ETH) glyph na egwu

ETH bụ ego crypto. Ọ bụ ego dijitalụ dị ụkọ nke enwere ike iji mee ihe na ịntanetị - yitere Bitcoin. Ịbụrụ onye ọhụrụ na crypto, nke a bụ etu ETH si dị iche na ego ọdịnala.

N'ezie ọ bụ nke gị

ETH na-ahapụ gị ka ịbụrụ ụlọ akụ nke onwe gị. Ị ga ejikwanwu ego gị site na obere akpa gị nke na egosi ihe akaebe na gị nwe - onye nke atọ adịghị mkpa.

Echekwara ya site na cryptography

Ego ịntanetị nwere ike bụ ihe ọhụrụ kama echekwara ya site nzipụta cryptography. Nke a na-echekwa obere akpa gị, ETH gị na azụmahịa gị nile.

Ịkwụ ụgwọ na esi n'ọgbọ fere n'ọgbọ

Ị nwere ike i ziga ETH gị na agaghị n'aka ndị nnọ n'etiti ọ bụla dịka ụlọ ọba ego. Ọ dịka I nye mmadụ ego n'aka, ma Ị nwere ike ime nke gị na mmadụ n'ụzọ echekwara, ebe ọ bụla na oge ọ bụla.

Enweghị isi ọnọdụ etiti

ETH bụ ihe ọra ma zukwaa ụwa ọnụ. O nweghi ụlọ ọrụ maọbụ ụlọ akụ nwere ike ị sị ka ha biputakwo ụfọdụ ETH, maọbụ gbanwee usoro eji ejkwa ya.

Omepere nye onye ọ bụla

Sọsọ ihe ị chọrọ bu njikọ ịntanetị ya na akpa iji anabata ETH. Ịgaghị acho ohere ịnweta akaụntụ nke ụlọ akụ maka inabata ịkwụ ụgwọ.

Ọ dị na ego na agbanwe agbanwe

ETH ga ekewanwu ruo ebe nkeji 18 ka gị ghara ịzụtaru otu ETH n'ozuzu. Ị nwere ike zụta irighiri ya n'otu oge - opekata mpe ihe erughi ETH 0.000000000000000001 ma ịchọọ.

Choro ịzụta ọfọdụ Ethereum? Ọ bụ ihe na-emekarị ịgwakọta Ethereum na ETH. Ethereum bụ blockchain na ETH bụ isi akụ nke Ethereum. ETH bụ ihe ị na achọ ịzụta. Uhe ndị ọzọ na Ethereum.

Kedụ ihe pụrụ iche na ETH?

Ọ di ọtụtụ ego crypto na ụbara akara ego ndị ọzọ na Ethereum, kama ọ di ihe ụfọdụ bụ naanị ETH ga emenwu.

ETH na akwanite ma na-eche Ethereum nche

ETH bụ ọbara nke ndụ Ethereum. Mgbe izipụrụ ETH ma ọ bụ jiri ngwa Ethereum were mee ihe, ị ga-akwụ ụgwọ na ETH iji netwọk Ethereum were mee ihe. Ụgwọ a bụ ihe mkpalite nye ndị na-emepụta ihe mgbochi iji mezie ma chọpụtakwa ihe ị na-achọ ime.

Ndị ọrụ nkwado dị ka ndị na-edenye ihe gbasara Ethereum-ha na enyochapụta ma gosipụta na o nweghi onye na-aghọ aghụghọ. A na-ahọrọghari ha na-enweghị ụkpụrụ ịtụpụta ngọngọ nke azụmahịa. A na kwukwa ma na-enyekwa ndị na-akwado ọrụ ahu ụgwọ ọrụ obere ego ETH ewepụtara ọhụrụ.

Ọrụ ndị na-akwado na arụ, yana isi ego ha na-etinye, na eweta nchekwa Ethereum nke na enweghị njikwa isi onodu etiti. ETH n'enye Ethereum ike.

Mgbe ịtinyere ETH gị, ị na-enye aka ịchekwa Ethereum ma nwetakwa ụgwọ ọrụ. Na sistemụ a, egwu maka ịla n'iyi ETH na-egbochi ndị nke na-awakpo awakpo. Ihe ndị ọzọ gbasara ntinye ego

ETH na akwadobe usoro ego nke Ethereum

Ịnweghị ojuju afọ n'ihi ụgwọ akwụrụ, ndị obodo Ethereum na-aruputa usoro ego dum na eme ka ego si na aka fere aka na erute kwa onye ọ bụla.

Ị nwere ike iji ETH nye dịka ihe nkwekọrịta aga eji emepụta akara akwụkwọ ego crypto pụrụ iche iche na Ethereum. Tinyekwara na, ị nwere ike ịbinye, bunye na nweta nwetakwa ma nwetakwa ọmụrụ nwa nke ETH na akara ndị ọzọ ETH na akwadobe.

Wrapped ether (WETH) is used to extend the functionality of ETH to work with other tokens and applications. Learn more about WETH.

Ihe eji ETH eme na-aba ụba kwa ụbọchị

Maka na Ethereum bụ ihe kọmputa, ndị mmepụta ihe nwere ike ịhazi ETH n'ụzọ di iche iche.

Na oge 2015 gara aga, ihe niile ị ga emenwu bụ izipu ETH site na akaụntụ Ethereum gaa na akaụntụ ọzọ. Nke a gụnyere ihe ụfọdụ ị nwere ike ime taata.

Kedu ihe mere ETH jiri bá uru?

Uru ETH bara uru n'ụzọ dị iche iche nyere ndị dị iche iche.

Maka ndị na eji Ethereum, ETH bara uru maka na ọ na-enye gị ohere ịjị kwụ ụgwọ azụmahịa.

Ndị ọzọ hụrụ ya dị ka ụlọ ahịa uru dijitalụ maka na mmepụta ETH ọhụrụ na-ebelata kwa oge ọbụla.

Na nso nso a, ETH abụrụwo ihe bara uru nye ndị na eji ngwa ego na Ethereum. Nke a bụ maka na ị nwere ike iji ETH dị ka ihe mgbanwe maka igbazinye ego crypto, ma ọ bụ dịka ihe eji akwụ ụgwọ.

N'eziokwu ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụzi ya dị ka ebe itinye ego, yitere Bitcoin ma ọ bụ akwụkwọ ego crypto ndị ọzọ.

ETH abụghị naanị crypto enwere na Ethereum

Onye ọ bụla nwere ike ikepụta ụdị akụ ọhụrụ ma rekwaa ha na Ethereum. Njirimara ihe ndia bụ 'tokens'. Ndị mmadụ a gbanweela ego ọdịnaala, ahịa ịrẹ ụlọ ha, ihe eserese ha, nakwa onwe ha n'ụdị token!

Ethereum bụ ụlọ nke ọtụtụ puku ihe akara ego - ụfọdụ ka eji emepụta ihe ma ba kwaa uru karịa ndị ọzọ. Ndị nrụpụta na arụpụta ihe akara ego ọhụrụ nke na-emeghe ụzọ ọhụrụ ma na emepe ahịa ọhụrụ.

Ihe ndị ọzọ gbasara akara na ihe ndi eji ha eme

Udị token a ma ama

Crptocurrency ana etinye na udi aku ndi ozo

Akara na-egosi uru ego ọdịnala dị ka dollar. Nke a na-emezi nsogbu mgbanwe na ọtụtụ cryptocurrency.

Akara eji achị ọchịchị

Akara nke na-anọchi anya ikike eji ebinye aka n'ime ụlọ ọrụ na enweghị sọ otu onye na achi.

Sh*t coins

N'ihi na ọ dị mfe imeputa token ọhụụ, onye ọ bụla nwere ike ime ya - ma ndi bu ajọ ihe n'obi ma ndi echiche obi ha akwụghị ọtọ. Gbambọ hụ na ị nyochaa ha tupu Ị metu ha aka!

Akara ego mkpokọta

Ihe akara ego nke na-anọchi anya ihe egwuregwu akpakọtara, mpekere nka dijitalụ, ma ọ bụ akụ ndị ọzọ nke enweghi oyiri. Nke a maara nke ọma dị ka ihe akara ego na-adighị agbanwe agbanwe (NFTs).

Nwalee ihe ị ma maka Ethereum

Loading...

Ibe a ọ nyere aka?