Uzo esi agbanwe tokens
Ike agwụla gị n'ịchọ mgbanwe na-edepụta tokin ọkacha mmasị gị niile? I nwere ike ịgbanwe ọtụtụ n'ime tokin site na iji mgbanwe enweghị isi.
Ngbanwe tokin na-agụnye mgbanwe nke akụ abụọ dị iche iche dị na netwọk Ethereum, iji maa atụ ịgbanwere ETH maka DAI (tokin ERC-20). Usoro a dị ọnụ ala ma dịkwa ngwa ngwa. Ị ga-ewe obere akpa ego ịntanetị crypto iji gbanwee tokin.
Ihe a chọrọ:
- nwere akpa ego ịntanetị crypto, i nwere ike soro nkuzi a: Etu e si eme: "Debanye aha" akaụntụ Ethereum
- tinye ego na akpa ego ịntanetị gị
Otu. Jikọọ akpa ego ịntanetị gị na mgbanwe dịịrị onwe ya (DEX) nke nhọrọ gị
Ụfọdụ ebe mgbanwe ndị a ma ama bụ:
- Uniswap(opens in a new tab)
- Sushiswap(opens in a new tab)
- 1 inch(opens in a new tab)
- Curve(opens in a new tab)
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụtakwu banyere ihe DeFi bụ nakwa etu ụdị mgbanwe ọhụrụ a sị arụ ọrụ, any nwere ike ị tụrụ gị aka n' Ọba Akwụkwọ Kernel(opens in a new tab).
abuo. Họrọ ụzọ tokin nke ị chọrọ ịgbanwe
Iji maa atụ, ETH na DAI. Gbaa mbọ hụ na i nwere ego n'otu n'ime akpa ego ịntanetị abụọ ahụ.
Ato. Tinye ego nke tokin ị chọrọ ịzụ ahịa ya wee pịa aka na ngbanwe
Ebe ngbanwe ahụ ga-agbakọ tokin ole ị ga-enweta ozugbo.
4. Kwado azụmahịa ahụ
Nyochaa nkọwa nke azụmahịa ahụ. Lelee ọnụego mgbanwe na ụgwọ ọzọ ọbụla maka iji gbochie ihe ịtụnanya nke jọgburu onwe ya.
5. Chere ka a hazie azụmahịa ahụ
I nwere ike ịlele ọganihu nke azụmahịa ahụ n'ihe nchọgharị blọkchen ọbụla. Usoro a ekwesịghị iwe ihe karịrị nkeji 10.
Ị ga-enweta tokin nke a gbanwere n'akpa ego ịntanetị gị ozugbo e mechara azụmahịa ahụ.
Frequently asked questions
Enwere m ike ịgbanwe ETH maka BTC n'akpa ego ịntanetị m?
Mba, i nwere ike ịgbanwe naanị akpa ego ịntanetị nke sitere na netwọk Ethereum, dị ka ETH, tokin ERC-20 maọbụ NFT. I nwere ike ịgbanwe naanị ụdị fọm "e kedoro" nke Bitcoin dị n'Ethereum.
Kedu ihe bụ slịpeeji?
Ọ bụ ihe dị iche n'etiti ọnụego mgbanwe gị na-atụ anya na ihe ọnụego nyere.