Mafee na isi ọdịnaya

Emelitere peeji ikpeazụ: 10 Ọktoba 2023

Otu esi eji obere akpa intanet

Mụta ka e si arụ ọrụ niile dị mkpa nke akpa ego ịntanetị. Ọ bụrụ na i nwebeghị otu, lelee Etu esi eme: mepụta akaụntụ Ethereum anyị.

Mepee akpa ego ịntanetị gị

Ị ga-ahụ dashịbọọdụ nke nwere ike igosi gị ego fọrọdụrụ ma nwee bọtịnụ iji zipu ma nata tokin.

Nweta ego crypto

Ị chọrọ ịnata crypto n'ime akpa ego ịntanetị gị?

Akaụntụ Ethereum ọbụla nwere adreesị nnabata nke ya nke bụ usoro ọnụọgụ na mkpụrụedemede pụrụ iche. Adreesị ahụ na-arụ ọrụ dị ka nọmba akaụntụ nke ụlọ akụ. Adreesị Ethereum ga-amaliterịrị na "0x". I nwere ike inye onye ọbụla adreesị a: e chedoro nke ọma ya.

Adreesị gị dị ka adreesị ụlọ gị: i kwesịrị ịgwa ndị mmadụ ihe ọ bụ ka ha wee nwe ike ichọta gị. I nwere nchedo ime nke a, n'ihi na ị ka nwere ike iji igodo ọzọ mechie ọnụ ụzọ ụlọ gị ka onye ọbụla ghara ịbanye na ya, ma ọ bụrụgodị na ha maara ebe i bi.

I kwesiri inye onye ọbụla chọrọ izigara gị ego n'adreesị ọha gị. Ọtụtụ ngwa akpa ego ịntanetị na-enye gị ohere maka iṅomi adreesị gị maọbụ igosi koodu QR ka ị nyochaa maka ojiji dị mfe. Zere iji aka pịnye adreesị Ethereum ọbụla. Nke a nwere ike ibuta n'ụzọ dị mfe na njehie nhazi na ego ifu efu.

Ngwa dị iche iche nwere ike di iche maọbụ na-eji asụsụ dị iche, mana ha kwesiri iduga gị na usoro yiri nke ahụ ma ọ bụrụ na ị na-agbalị iziga ego.

  1. Mepee ngwa akpa ego ịntanetị gị.
  2. Pịa aka na "Nata" (maọbụ nhọrọ okwu yiri ya).
  3. Detuo adreesị Ethereum gị na klipbọọdụ.
  4. Nye onye nziga adreesị iji enweta Ethereum gị.

Zipu ego crypto

Ọ ga-amasị gị izipu ETH gaa n'akpa ego ịntanetị ọzọ?

  1. Mepee ngwa akpa ego ịntanetị gị.
  2. Nweta adreesị nnabata wee hụ na e jikọrọ gị na otu netwọkụ ahụ dị ka nke onye nnata.
  3. Tinye adreesị nnabata maọbụ jiri igwe foto gị nyochaa koodu QR ka ị ghara iji aka dee adreesị ahụ.
  4. Pịa aka na bọtịnụ “Zipu” n'ime akpa ego ịntanetị gị (maọbụ ihe ọzọ a kpọrọ okwu yiri nke ahụ).

Zipu fiiludu maka adreesị crypto


  1. Ọtụtụ akụ, dị ka DAI maọbụ USDC, dị na ọtụtụ netwọkụ. Mgbe ị na-ebufe tokin crypto, jide n'aka na gị na onye nnata na-eji otu netwọkụ, ebe ọ bụ na a naghị agbanwe ya agbanwe.
  2. Gbaa mbọ hụ na tokin gị nwere ETH zuru oke iji kpuchie ụgwọ azụmahịa, nke dị iche dabere na ọnọdụ netwọkụ. Ọtụtụ akpa ego ịntanetị ga-agbakwunye ego nke a tụrụ aro maka azụmahịa nke i nwere ike kwado ya ozugbo.
  3. Ozugbo e mechara azụmahịa gị, ego crypto e kwekọritara ga-apụta na akaụntụ onye nnata. Nke a nwere ike were ebe ọbụla site na sekọnd ole na ole ruo nkeji ole na ole dabere na ole netwọkụ a na-eji ugbua.

Ijikọ n'ọrụ ngo

Adreesị gị ga-abụ otu na nkwekọrịta Ethereum niile. I kwesighị ịdebanye aha n'otu n'otu na nkwekọrịta ọbụla. Ozugbo i nwere akpa ego ịntanetị, i nwere ike jikọọ na nkwekọrịta Ethereum ọbụla na-enweghị ozi ọbụla ọzọ. E nweghị ozi ịntanetị maọbụ ozi nkeonwe ọbụla a chọrọ.

  1. Gaa na webụsaịtị ọrụ nke ọbụla.
  2. Ọ bụrụ na peeji ngwa ahụ bụ naanị nkọwapụta kwụ otu ebe ngwa ahụ, ị ga-enwe ike ịpị bọtịnụ “Mepee ngwa” dị na menu nke ga-ebugharị gị na ngwa webụ ahụ.
  3. Mgbe ị banyere na ngwa ahụ, pịa aka na "Jikọọ"

Bọtịnụ na-enye onye ojiji ọrụ ohere ijikọ na webụsaịtị akpa ego ịntanetị

  1. Họrọ akpa ego ịntanetị gị na ndepụta nhọrọ e nyere. Ọ bụrụ na ị hụghị akpa ego ịntanetị gị, ọ nwere ike bụrụ na o zoro n'okpuru nhọrọ nke "WalletConnect".

Selecting from a list of wallets to connect with

  1. Kwado arịrịọ nke mbinye aka n'akpa ego ịntanetị gị iji guzobe njikọ ahụ. Ibinye aka n'ozi a ekwesịghị iwe ETH ọbụla.
  2. Ọ bụ ya! Malitezie iji ngwa ahụ. I nwere ike ịhụ ụfọdụ ọrụ dị mma na peeji Ngwa nbipu anyị.
Chọrọ ịmụtakwu?
Hụ ntuziaka anyị ndị ọzọ

Frequently asked questions

Ọ bụrụ na m nwere adreesị ETH, enwere m otu adreesị na blọkchen ndị ọzọ?

I nwekwara ike iji otu adreesị ahụ na blọkchen niile dakọtara na EVM (ọ bụrụ na i nwere ụdị akpa ego ịntanetị nwere nkebi ahịrịokwu mgbake). Ndeputa a(opens in a new tab) ga-egosi gị blọkchen nke i nwere ike ị na-ejikọta ya na otu adreesị ahụ. Ụfọdụ blọkchen, dị ka Bitcoin, na-emejuputa usoro iwu netwọk dị iche iche ma ị ga-achọ adreesị dị iche nakwa usoro dị iche. Ọ bụrụ na i nwere ngwa akpa ego ịntanetị i kwesiri ịlele webụsaịtị ngwaahịa ya maka ozi ndị ọzọ na-akwado blọkchen.

Enwere m ike iji otu adreesị ahụ n'ọtụtụ ngwaọrụ?

Ee, i nwere ike iji otu adreesị n'ọtụtụ ngwaọrụ. Akpa ego ịtanetị bụ naanị ebe mmekọrita iji gosi ego ole fọdụrụ n'akaụntụ gị na ime azụmahịa, e chekwaghị akaụntụ gị n'ime akpa ego ịntanetị, kama na blọkchen.

Enwetabeghị m crypto, ebee ka m nwere ike ije ịlele ọnọdụ azụmahịa?

I nwere ike iji blockexplorers hụ ọkwa azụmahịa ọbụla ozugbo. Naanị ihe ị ga-eme bụ ịchọ adreesị akpa ego ịntanetị gị maọbụ ihe njirimara azụmahịa ahụ.

Enwere m ike ịkagbu maọbụ weghachi azụmahịa?

Mba, ozugbo a kwadoro azụmahịa, i nweghị ike ịkagbu azụmahịa ahụ.

Edemede a ọ nyere aka?