Mafee na isi ọdịnaya

Tokin na-enweghị ike ịgbanwe (NFT)

  • Ụzọ e ji egosipụta ihe ọbụla pụrụ iche dị ka akụ Ethereum.
  • NFT na-enye ndị na-ekepụta ihe ikike karịa ka ọ dị na mbụ.
  • Nke usoro ngwaọrụ kọmputa kwadoro na blọkchen Ethereum.
A na-egosipụta akara Eth site na hologram.

Kedu ihe bụ NFTs?

NFT bụ tokin nke pụrụ iche n'onwe ha. NFT ọbụla nwere akụrụngwa dị iche iche (nke e ji egosipụta nnwe) ma ọ dikwa ụkọ. Nke a dị iche na tokin dị ka ERC-20s ebe tokin ọbụla yiri onwe ya ma nwee otu akụrụngwa ('nwere ike igbanwe'). Ị chọghị ịma kpọmkwem ụgwọ dọla i nwere n'akpa ego ịntanetị, n'ihi na ha niile yiri onwe ha ma bụrụ otu ọnụ ahịa. Agbanyeghị, ị na-eme na-elekọta NFTnke i nwere kpọmkwem, n'ihi na ha niile nwere akụrụngwa nkeonwe nke mere ka ya na ndị ọzọ dị iche ('nke apụghị igbanwe').

Ọdịiche nke NFT ọbụla na-eme ka akara na apụghị igbanwe ọbụla na-enye aka ịmepụta ihe dị ka nka, mkpokọta, maọbụ ụlọ ebe obibi ndị mmadụ, ebe otu NFT pụrụ iche na-anọchite anya ọtụtụ ihe a na-ahụ anya maọbụ akụrụngwa dijitalụ. Blọkchen Ethereum - o nweghị onye nwere ike ịgbanwee ndekọ nke nnwe maọbụ ṅomịa/ma doo NFT ọhụrụ ka o bidi dịwa.

Ịntanetị nke akụrụngwa

NFTna Ethereum na-edozi ụfọdụ nsogbu nke dị na ịntanetị taa. Dị ka ihe niile na-adịzị na dijitalụ, ọ dị oke mkpa imegharị akụrụngwa nke ihe ana-ahụ anya dị ka ụkọ ihe, ọpụrụiche, nakwa ihe akaebe nke nnwe. n'ụzọ na-enweghị ụlọ ọrụ etiti nke na achịkwa ya. Iji maa atu, na NFT, i nwere ike inwe egwu mp3 na-abụghị maka ngwa egwu otu ụlọ ọrụ kpọmkwem, maọbụ i nwere ike inweta njikwa mgbasa ozi nke i nwere ike ree maọbụ gbanwee, mana onye na-ahụ maka nhiwe enweghị ike ịnapụ gị ya.

Nke a bụ etu ịntanetị NFT si dị ma a tụnyere ya na ịntanetị ọtụtụ n'ime anyị na-eji taa...

Ntụnyere

Ịntanetị NFTỊntanetị ụbọchị taa
Gị nwe ihe onwunwe nke gị! Naanị gị nwere ike ire maọbụ gbanwee ha.Ị gbazitere ego n'aka ụfọdụ ndị ụlọ ọrụ.
NFT bụ dijitalụ pụrụ iche, o nweghị NFT abụọ bụ otu ihe.E nweghị ike ịchọpụta nke bụ nke n'etiti nke ezigbo na nke nṅomị.
E chedoro nnwe NFT na blọkchen ahụ ka onye ọbụla nwee ike inyocha ya.A na-echekwa ndekọ onwunwe na sava nke ndị ụlọ ọrụ na-achịkwa - ị ga-ewererịrị okwu ha maka ya.
NFT bụ ngwa kọmputa n'Ethereum. Nke a pụtara na ọ ga-adị mfe iji ha na ngwa kọmputa ndị ọzọ nakwa dị n'Ethereum!Ndi ụlọ ọrụ nwere akụrụngwa dijitalụ na-achọkarị akụrụngwa "ihe nhiwe" nke ha.
Ndị nkepụta nwere ike ire ihe nkepụta ha ebe ọbụla ma nwee ikike ire ahịa n'ahịa mba.Ndị nkepụta na-adabere n'akụrụngwa na nkesa nke nhiwe ha na-eji. Ndị a na-adịkarị n'okpuru usoro ojiji yana mgbochi mpaghara.
Ndị nkepụta NFT nwere ike jigide ikike onwunwe nyere ihe ha kepụtara, ma mee ka e nwee ntụkwasị obi na ngwa NFT.Nhiwe, dị ka ọrụ ndị na-eme ka e gee egwu, na-ejigide ọtụtụ nhiwe nke sitere n'ire ahịa.

Kedu ka NFT si arụ ọrụ?

Dị ka tokin ọbụla e nyere n'Ethereum, ngwa kọmputa na-enye NFT. Ngwa kọmputa na-ekwekọrọ n'otu n'ime usoro NFT (na-abụkarị ERC-721 maọbụ ERC-1155) nke na-akọwapụta ọrụ ngwa ahụ nwere. Ngwa ahụ nwere ike imepụta ('mint') NFT ma kenye ha n'aka onye nwe ya. A kọwara ikike nnwe na ngwa nkwekọrịta site n'idepụta NFT gaa na adreesị nke ọ bụ. NFT ahụ nwere Njirimara nkwa data meta nke metụtara ya nke mekwara ka tokin ahụ dịrị onwe ya iche.

Mgbe mmadụ keputa maọbụ mepụta NFT, ha na-arụ ọrụ na ngwa kọmputa na-enye NFT ọbụla adreesị. E chedoro ozi a n'ebe nchedo ngwa ahụ, nke so na blọkchen. Onye nkepụta ngwa kọmputa ahụ nwere ike ide ihe ọzọ n'ime ngwa ahụ, iji maa atụ, ibelata mkpokọta ọnụọgụ nnyefe maọbụ ịkọpụta ụgwọ a ga-akwụ onye nkepụta mgbe ọbụla e nyefere tokin.

Kedu ihe a na-eji NFT eme?

E ji NFT eme ọtụtụ ihe, gụnyere:

  • igosi na ị gara mmemme
  • gosikwa na ị gụchara akwụkwọ
  • ihe onwunwe maka egwuregwu
  • ihe nka dijitalụ
  • iji tokin goro akụ a na-ahụ anya
  • igosi njirimara ịntanetị gị
  • inweta ikike maka ịhụ ihe dị na ya
  • inweta tiketi
  • aha ngalaba ịntanetị na-enweghị onye isi
  • ihe mbinye ego na DeFi

Eleghị anya ị bụ onye omenka chọrọ iji NFT kesaa ọrụ ha, na-emeghị ka njikwa funarịa gị ma jirikwa ihe nrita gị chụọrọ ndị ọrụ etiti aja. I nwere ike mepụtakwa ngwa ọhụrụ ma kwuo NFT ole, akụrụngwa ha nakwa akara njikọ a ga-eji nweta ha na netwọk ọ bụ. Dị ka onye mmeputa, i nwekwara ike itinye na ngwa kọmputa ahụ ụgwọ ole a ga-akwụ gị (iji maa atụ, nye onye nwe ngwa kọmputa pasent 5 nke ego ole erere mgbe ọbụla e nyefere NFT). I nwekwara ike igosi na i mepụtara NFT n'ihi na ọ bụ gị nwe akpa ego ịntanetị ahụ dị na ngwa kọmputa ahụ. Ndị na-azụ gị ahịa nwekwara ike igosipụta na ha nwere ezigbo NFT sitere na mkpokọta gị maka tokin ngwa kọmputa gị metụtara adreesị tokin ha. Ha nwere ike iji ya n'ihe metụtara Ethereum, ma nwee ntụkwasị obi n'ịdị mma ya.

Maọbụ tụlee tiketi maka maka mmemme egwuregwu. Dị ka etu onye nhazi ihe mmemme ga-esi nwee ike ịhọrọ ọtụtụ tiketi ọ ga-ere, onye nkepụta NFT nwere ike kpebie nṅomị ole ga-adi. Oge ụfọdụ ndị a bụ nṅomị yiri ibe ya, dị ka Tiketi Nnabata Ọha 5000. Oge ụfọdụ, a na-ekepụta ọtụtụ ndị yiri onwe ha, mana nke ọbụla dịtụ iche, dị ka tiketi nwere oche e kenyere ya. E nwere ike ịzụta ihe ndị a ma rekwaa ha na-akwụghị ndị na-ahụ maka tiketi ụgwọ ma onye na-azụ ahịa ji n'aka mgbe niile na tiketi ahụ bụ nke ezigbo ya site n'inyocha adreesị ngwa kọmputa.

N'ethereum.org, a na-eji NFT egosi na ndị mmadụ enyela aka na nzube GitHub anyị maọbụ zaa oku, ma anyị enwetala aha ngalaba NFT aha. Ọ bụrụ na i nyere aka n'ethereum.org, i nwere ikwu maka isonye gị na POAP NFT. Ụfọdụ ebe nzube kripto JIRILA tiketi POAP. Ihe ndị ọzọ na ntinye aka.

POAP ethereum.org

Webụsaịtị a nwekwara aha ngalaba ọzọ nke NFT kwadoro, ehereum.eth. A na-eji .org naanị aha ngalaba onye nweta sistemụ achịzi adreesị anyị (DNS), ebe ethereum.eth e debenyere Ethereum site n'Aha Ọrụ Ethereum ahụ (ENS). Ọ bụ kwa anyị nwe ma na-ejikwa ya. Lelee ndekọ ENS anyị(opens in a new tab)

Ihe ndị ọzọ n'Ethereum(opens in a new tab)

Nchekwa NFT

Nchekwa Ethereum na-esi n'ihe akaebe-nke-itinye ego abịa. E mere sistemụ a ka o wee belata ajọ akpamagwa, wee mee ka Ethereum ghara ịna-egbanwe. Nke a bụ ihe na-eme ka NFT dị ire. Ozugbo blọk azụmahịa NFT dị na ya bịara na njedebe, ọ ga-eri onye na-ezu ohi nde kwuru nde Ethereum igbanwe ya. Onye ọbụla na-eji ngwa Ethereum nwere ike ịchọpụta na a na-achọ aka itinye aka ná NFT n'ụzọ n'ezighị ezi, ma a ga-atakwa onye ahụ ahụhụ wee chụpụkwa ya.

Okwu nchekwa metụtara NFT na-abukari ihe gbasara ozi maka iji aghụghọ nara mmadụ ihe, wepụta ngwa kọmputa maọbụ njehie onye ojiji (dị ka iwepụta igodo nkeonwe), na-eme ezigbo nchekwa akap ego ịntanetị taa akpụ nyere ndị nwe NFT.

Ihe ndị i ọzọ na nchekwa

Further reading

Nwalee ihe ị ma maka Ethereum

Loading...

Ibe a ọ nyere aka?