Stebụlkọịn
Ego dijitalụ maka iji kwa ụbọchị
Stebụlkọịn bụ tokin Ethereum e mebere ka ọ nọrọ n'ọnụahịa a kapịrị ọnụ, ọbụlagodi mgbe ọnụahịa ETH gbanwere.

Kedu ihe o jiri bụrụ stebụlkọịn?
Stebụlkọịn bụ ego kripto nke ihe adịghị akwagharị. Ha nwere ọtụtụ ụdị ike ETH nwere mana uru ha kwudosiri ike, dị ka ego obodo. Nke a bụ na i nwere ikike iji ego stebụlkọịn n'Ethereum. Etu stebụlkọịn si enweta ịkwụdosi ike ha
Stebụlkọịn gbara gbururu gburu, ma o nwekwara ike izipunwu ha ebe ọbụla n'ịntanetị. Ha di mfe inweta maọbụ izipu ma ọ bụrụ na i nwere akaụntụ Ethereum.
Ọchịchọ stebụlkọịn dị elu, nke a bụ na ị ga-amitanwu ọmụrụnwa make ibinye ego nke gi. Gbaa mbọ hụ na ị matara ihe na-eweta ọghọm tupu i binye ego.
E nwere ike iji stebụlkọịn gbanwee ETH na tokin Ethereum ndị ọzọ. Ọtụtụ ngwa dapp na-adabere na stebụlkọịn.
A na-eji kriptografi echekwa stebụlkọịn. E nweghi onye ga-aghọrịnwu nzikọ azụmahịa na nnọchi anya gi.
Bitcoin pizza a ma ama
Na 2010, mmadụ ji Bitcoin 10,000 zụta pizza 2. N'oge ọnụ ahịa ndị bụ ~$ 41USD. N'ahịa taa, nke ahụ bụ nde kwuru nde dollar. E nwere ọtụtụ azụmahịa dị etu a na-enye mwute n'akụkọ Ethereum. Stebụlkọịn doziri nsogbu a, yabụ i nwere ike ịta Pizza gị ma jigide ETH gị.
Chọta ego stebụlkọịn
E nwere ego stebụlkọịn narị kwuru narị dị. Ndị a bụ ụfọdụ ga-enyerenwu gị aka iji malite. Ọ bụrụ na ị bidoro ọhụrụ n'Ethereum, anyị na-akwado ka i burugodu ụzọ mee nnyocha.
Mmasị ndị ndezi
Ugbua, ndị a bụ ọmụmatụ stebụlkọịn ma bụrụkwa mkpuru ego ndị anyị hụrụ bara uru mgbe anyị na-eji dapp.
Dai
Dai bụ mkpụrụ ego kripto na-adịghị adagharị adagharị nke na-enweghi onye isi a kacha mara. Ọnụahịa ya bụ ihe dị ka otu dọla ma bụrụkwa nke a kacha anabata n'etiti dapp ndị ọzọ.

USDC
USDC nwere ike ịbụ stebụlkọịn ego fịyatị kwadoro nke a kacha mara. Ọnụahịa ya bụ ihe dị ka otu dọla ma ego Sekụl na Kọịnbez kwadokwara ya.

Stebụlkọịn nke sitere n'irite uru ahịa
Irite uru ahịa bụ mkpokota ọnụọgụ dị nke mụbara ọnụ ahịa nyere tokin n'otu n'otu. Ndeputa nke a na-agbanwe agbanwe ma arụmọrụ dị na ya e deputara ebe a enwechaghị nkwado sitere n'ethereum.org team.
Ego | Irite uru ahịa | Ụdị nke ihe ihe akaebe | ↗ |
---|---|---|---|
![]() | $141,710,364,110 | Fịyatị | Go to Tether |
![]() | $56,464,047,408 | Fịyatị | Go to USDC |
![]() | $3,477,370,906 | Crypto | Go to Dai |
![]() | $630,990,041 | Nke usoro emume | Go to Frax |
![]() | $623,106,252 | Crypto | Go to usdx.money USDX |
![]() | $604,389,816 | Ọla dị oke ọnụ | Go to PAX Gold |
![]() | $492,898,696 | Fịyatị | Go to TrueUSD |
Otu e si enweta ego stebụlkọịn
Were stebụlkọịn chedoo ego
Stebụlkọịn na-enwe egoahia na akarị okike ọmụrụnwa maka na e nwere ọtụtụ ọchịchọ maka ibite ha. E nwere ngwa dapp na-enye gi ikike ka ị na-erita ọmụrụnwa na stebụlkọịn n'oge site n'ikwunye ha n'ebe okike. Dị ka o si dị n'ụlọ akụ, ị na-eke tokin gi maka ndị mbite ego mana i nwekwara ike iwere tokin na ọmụrụnw gị mgbe ọbụla.
Dapp ndị na-amịpụta ọmụrụnwa
Were stebụlkọịn gị mee ihe bara uru ma mita ọmụrụnwa. Dika ihe nile di na kripto, Pasenti Ọmụrụnwa A Tụrụ Anya ya Kwa Afọ (APY) nwere ike igbanwe ụbọchị kwa ubochi dabere n'ozugbo e kesara maọbụ chọọ ha.
Etu ha si arụ ọrụ: ụdị stebụlkọịn dịgasị
Hụ na ị na-e me nnyocha nke gị mgbe niile
Algorithmic stablecoins are experimental technology. You should be aware of the risks before using them.Nke Fịyatị kwadoro
Uru
- E chekwara ya maka ndaghari kripto.
- Mgbanwe ọnụahịa dị obere.
Ọghọm
- Nke nwere onye isi – a ga enweriri onye ga-enye tokin.
- Ọ dị mkpa ka e nyochaa ya iji hụ na ụlọ ọrụ nwere ndobe akụ zuru ezu.
Nke crypto kwadoro
Ọla dị oke ọnụ
Nke usoro emume
Mụtakwuo ihe banyere stebụlkọịn
Dashboard na Education
- GaaStablecoins.wtfStablecoins.wtf na-enye ngosi dashịbọọdụ nwere data azụmahịa, ọnụ ọgụgụ, na ihe banyere mmụta maka ego stebụlkọịn pụrụ iche.