Gini bu Ethereum?
Ego crypto, dị ka Bitcoin, na-enyere onye ọbụla aka iziga ego na mba ụwa niile. Ethereum na-emekwa, mana o nwekwara ike iji koodu na-enyere ndị mmadụ aka imepụta ngwa na otu. Ọ na-agbanwe agbanwe ma e nwekwaa ike mee ya ka ọ dị na mbụ: e nwere ike jiri igwe kọmputa ọbụla rụọ ọrụ n'Ethereum. Mụtakwuo ihe ndị ọzọ ma chọpụta etu e si amalite:
Gini bu Ethereum?
Ị bụrụ onye ọhụrụ, malite ebe a ka ị mata ihe kpatara Ethereum ji dị mkpa.

Kedu ka m ga-esi eji Ethereum?
Iji Ethereum nwere ike ịpụta ọtụtụ ihe nyere ọtụtụ mmadụ. O nwere ike bụrụ na ị chọrọ ịbanye na ngwa, gosipụta njirimara ịntanetị gị, maọbụ bufee ụfọdụ ETH. Ihe mbụ ị ga-achọ bụ akaụntụ. Ụzọ kachasị mfe iji mepụta na nweta akaụntụ bụ iji ngwanrọ a na-akpọ akpọ akpa ego ịntanetị.
Kedu ihe bụ wọlet?
Dijitalụ akpa ego ịntanetị bụ ezigbo wọlet; ha na-echekwa ihe ị chọrọ iji gosi njirimara gị wee nweta ebe ndị i ji kpọrọ ihe.

Ihe ndị ị ga-atụle mgbe ị na-eji Ethereum eme ihe
- Azụmahịa Ethereum ọbụla chọrọ ego n'ụdị ETH, ọbụlagodi na ị chọrọ iwega tokin dị iche iche sitere n'Ethereum dị ka stebụlkọịn USDC maọbụ DAI.
- Ụgwọ nwere ike ịdị elu dabere n'ọnụ ọgụgụ ndị na-achọ iji Ethereum, ya mere anyị na-akwado iji Ebe mmezi 2s.

Kedu ihe a na-eji Ethereum eme?
Ethereum emeela ka imepụta ngwaahịa na ọrụ ọhụrụ nke nwere ike imezi akụkụ dị iche iche nke ndụ anyị. Anyị ka nọ na mmalite mana e nwere ọtụtụ ihe ị ga-enwe mmasị na ya.
Ego n'enweghi nchikwa (DeFi)
Chọgharịa sistemụ ego ọzọ nke e wuru na-enweghị ụlọ akụ nke onye ọbụla nwere ike irita erere na ya.

Crptocurrency na anochite anya ego ndi ozo
Ego Crypto tụkwasịrị n'ọnụahịa ego, ngwa ahịa, maọbụ ngwa ego ọzọ.

Non-fungible tokin (NFTs)
Na-anọchi anya ikike inwe ihe pụrụ iche, site na nka ruo na deeds rukwaa akwụkwọ ịkwụ ụgwọ.

Otu zoro ezo n'enweghi otu onye nchikwa (DAOs)
Kwadoo ụzọ ọhụrụ iji hazie ọrụ na-enweghị onye isi.

Ngwa komputa na aru oru na sistemu komputa (dapps)
Mepụta akụ na ụba dijitalụ nke ọrụ ndị ọgbọ na ọgbọ.

Okwu ojiji na-apụta
E nwekwara ụlọ ọrụ ndị ọzọ a ma ama e ji Ethereum mepụta maọbụ kwalite:
Mee netwọk Ethereum ka o sie ike
I nwere ike inye aka chekwaa Ethereum ma nweta ụgwọ ọrụ n'otu oge site n'itinye ETH gị. E nwere nhọrọ dị iche iche maka itinye nke dabere n'ihe ihe i kwesiri ịma nakwa ETH ego ole i nwere.
Run a node
Rụọ ọrụ dị oke mkpa na netwọk Ethereum site n'ijikwa igwe computa gị na bitcoin.

Mụta maka usoro Ethereum
Maka ndị ojiji nwere mmasị n'ihe e kwesiri ịmụ na netwọk Ethereum.
Mapụ nke ụzọ Ethereum
Maapụ ụzọ Ethereum na-eme ka ọ dịkwuo mfe, nwee nchekwa, ma dịgidekwa.

Mụtakwa maka otu Ethereum
Ọganihu nke Ethereum bụ ekele nyere ịgba mbọ pụrụ iche nke ndị otu ya. Ọtụtụ puku mmadụ nwere mmasị na mmụọ mkpali na-enye aka ịkwalite atụmatụ Ethereum, ma na-enyekwa nchedo na netwọk site n'itinye na ọchịchị. Bịa sonyere anyị!
How can I get involved?
A na-anabata gị (ee, gị!) n'iso nye aka n'otu Ethereum.

Ogbe ndị dị n'ịntanetị
Ndị otu ịntanetị na-enye ohere dị ukwuu ịjụ ajụjụ ndị ọzọ a kọwapụtara maọbụ sonye.

Akwụkwọ na pọdkastị
Akwụkwọ maka Ethereum
- Ndị Cryptopian February 22, 2022 - Laura Shin
- Sitere na Ether Septemba 29, 2020 - Matthew Leising
- Igwe n'Enweghị Ngwụcha Julaị 14, 2020- Camila Russo
- Ịmata ihe banyere Ethereum nke ọma Disemba 23, 2018 - Andreas M. Antonopoulos, Gavin Wood Ph.D.
- Ihe Akaebe nke Ntinye Ego Septemba 13, 2022- Vitalik Buterin, Nathan Schneider
Pọdkastị maka Ethereum
- Ntụpọ na-acha ndụ ndụ Chọọ usoro akụ na ụba crypto nke na-emepụta ihe dị mma nyere ụwa
- Amaghị Ihe Ọbụla Na-abanye n'ime teknụzụ nke ga-eme ka ebe ịrụ ọrụ nke weebụ na-apụtaghị ìhè na otu na-ehiwe nke a
- Enweghị eriri Na-abanye n'ime ndị na-ehiwe ịntanetị na-enweghị onye isi ndu, nkọwa nke nkà na ụzụ nke nwere ike ịkwado ọdịnihu anyị, nakwa ụfọdụ isiokwu kachasị sie ike na crypto, dị ka iwu, nchekwa na nzuzo
- Gwei nke Ụbọchị Ọbụla Mkpokọta akụkọ maka Ethereum, nkwalite na nnyocha
- Nke enweghị ụlọ akụ Ntuziaka nke ego Crypto