Mafee na isi ọdịnaya

Emelitere peeji ikpeazụ: 10 Ọktoba 2023

Otu e si amata tokin adigboloja

One of the most common uses for Ethereum is for a group to create a tradable token, in a sense their own currency. Tokin ndị a na-agbasoro ọkọlọtọ, ERC-20. Agbanyeghị, n'ebe ọbụla e nwere okwu ikpe ziri ezi na-eweta ihe nrita, a ga-enwekwa ndị mmempụ na-achọ izuru ihe nrita ahụ maka onwe ha.

E nwere ụzọ abụọ ha nwere ike isi duhie gị:

  • Iresị gị tokin adigboloja, nke nwere ike ịdị ka ezigbo tokin ị chọrọ ịzụ, mana ndị adigboloja na-enye ya na-enweghị uru ọ bara.
  • Ịghọgbu gị ịbanye na azụmahịa ọjọọ, site n'iduga gị n'ebe nhiwe onye ọrụ nke ha. Ha nwere ike ịchọ ime ka i nye ngwa kọmputa ha ikike na tokin ERC-20 gị, na-ekpughe ozi dị nro nke na-enye ha ohere ịnweta akụ gị, wdg. Ebe njikọ ndị ojiji a nwere ike ịbụ ihe dịchaa ka nke dị n'ezigbo weebụsaịtị, mana ọ ga-enwe aghụghọ zoro ezo.

Iji gosi ihe tokin adigboloja bụ, yana otu e si amata ha, anyị ga-eleba anya n'ihe atụ nke otu: wARB(opens in a new tab). Tokin na-achọ ịdị ka ARB(opens in a new tab) tokin.

Kedu ka tokin adigboloja si arụ ọrụ?

Ihe niile maka Ethereum bụ ọdịịrịonwe. Nke a pụtara na o nweghị ikike nwere ike ịnara akụ gị maọbụ gbochiere gị iji igwe na-arụ nke aka ya. Mana ọ pụtakwara na ndị adigboloja nwere ike iji ngwa kọmputa ọbụla ha chọrọ.

Kpọmkwem, Arbitrum wepụrụ ngwa kọmputa na-eji akara ARB. Mana nke ahụ anaghị egbochi ndị ọzọ ibuga ngwa na-eji otu akara ahụ, maọbụ nke yiri ya. Onye ọbụla na-ede ngwa ahụ ga-edozi ihe ngwa ahụ ga-eme.

Na-egosi na o ziri ezi

E nwere ọtụtụ ụzọ aghụghọ ndị na-emepụta tokin adigboloja na-eme ka ọ dị ka ọ bụ nke ziri ezi.

  • Aha na akara ziri ezi. Dị ka e kwuru na mbụ, ngwa ERC-20 nwere ike inwe otu akara na aha dịka ngwa ERC-20 ndị ọzọ. I nweghị ike ịtụkwasị obi na mpaghara ndị ahụ maka nchekwa.

  • Ndị nnwe ziri ezi. Tokin adigboloja na-ebutekarị itule dị ukwuu n'adreesị nke iche na ọ bụ ndị ji ezigbo akara ahụ.

    Iji maa atụ, ka anyị leba anya na wARB ọzọ. Ihe dị ka tokin 16%(opens in a new tab) bụ adreesị nke mkpado ọha ya bụ Arbitrum Foundation: Onye na-ebunye(opens in a new tab). Nke a bụ ọ bụghị adreesị adịgboroja, ọ bụ n'ezie adreesị nke debere ezigbo nkwekọrịta ARB na Ethereum mainnet(opens in a new tab).

    N'ihi na ego fọdụrụ na ERC-20 nke adreesị so na ihe gbasara nchekwa ọrụ ngwa ERC-20, e nwere ike iji ngwa ahu kọwaa ya ka ọ bụrụ ihe ọbụla onye ọrụ mmeputa chọrọ. Ọ ga-ekwe omume ka ngwa machibido inyefe ka ndị nji ziri ezi ghara inwe ike iwepu tokin ojoro ndị ahụ.

  • Nnyefe ziri ezi. Ndị nnwe ziri ezi agaghị akwụ ụgwọ iji bufee ndị tokin ojoro ndị ozo, yabụ ọ bụrụ na e nwere mbufe ọ ga-abụrịrị nke ziri ezi, ọ dị mma? Ọ dịghị mma. Nnyefe na-emepụta ihe omume site na ngwa ERC-20. Onye ojoro nwere ike dee nkwekọrịta n'ụzọ dị mfe n'ụzọ ọ ga-esi mepụta omume ndị ahụ.

Webụsaịtị adigboloja

Ndị ojoro nwekwara ike imepụta webụsaịtị pụrụ iche, mgbe ụfọdụ ọbụlagodi ijiri ihe ndị dị n'ezigbo webụsaịtị ma mee ka o nwee UI yiri onwe ha, mana n'ụzọ aghụghọ. Ọmụmatụ nwere ike ịbụ njikọ mpụga nke dị ka o ziri ezi na-eziga onye ojiji na saịtị mpụga adigboloja, maọbụ ntụziaka na-ezighi ezi ga-eme ka onye ojiji kpughe igodo ha maọbụ ziga ego n'adreesị onye ojoro ahụ.

Ụzọ kachasị mma iji zeere nke a bụ iji nwayọọ lelee URL saịtị ndị ị gara na ha, ma chekwaa adreesị maka saịtị ndị ziri ezi na bumaakị gị. Mgbe ahụ, i nwere ike ịga na saịtị ziri ezi site na bumaakị gị n'adịghị iwu nsupe maọbụ dabere na njikọ mpụga.

Kedu ka ị ga-esi chedoo onwe gị?

  1. Lelee adreesị nkwekọrịta. Tokin ziri ezi na-esi na ndị otu ụlọ ọrụ a ma ama abịa, ma i nwere ike ịhụ adreesị ngwa kọmputa na webụsaịtị ụlọ ọrụ. Iji maa atụ, maka ARB i nwere ike ịhụ adreesị ndị ziri ezi ebe a(opens in a new tab).

  2. Ezigbo tokin nwere oke . Nhọrọ ọzọ bụ ileba anya nha ogo na Uniswap(opens in a new tab), otu n'ime usoro ịgbanwe tokin a na-ahụkarị. Usoro a na-arụ ọrụ site na iji ogo puul, nke ndị o ji ego achụ ego na-etinye tokin ha ma buru n'uche na ha ga-enweta ọmụrụnwa maka ego ha kwụrụ.

Tokin adigboloja na-enwekarị obere ogo, ọ bụrụ na ọ dị, n'ihi na ndị ojoro achọghị itufu akụ. Iji maa atụ, ARB/ETH Uniswap puul nwere ike jiri ihe dị ka otu nde dollar (lee ebe a maka ihe nrita dị ugbu a(opens in a new tab)) n'ịzụ maọbụ ire obere ego agaghị agbanwe ọnụahịa:

Ịzụta tokin ziri ezi

Mana mgbe ị na-agbalị ịzụta a tokin adigboloja wARB, ọbụlagodi obere ị zụtara ga-agbanwe ọnụahịa karịa 90%:

Ịzụta tokin adigboloja

Nke a bụ ihe akaebe ọzọ na-egosi anyị wARB abụghị akara ziri ezi.

  1. Lee anya n'Etherscan. A chọpụtala ọtụtụ tokin adigboloja ma ndị otu ahụ emeela mkpesa maka ya. Ụdị tokin ahụ ka a kara aka n'Etherscan(opens in a new tab). Ebe Etherscan abụghị ebe nnweta ozi ziri ezi (ọ bụ usoro nke netwọk ndị dịịrị onwe na-enweghị ike ịbụ ebe nnweta ozi ziri ezi), tokin nke Etherscan na-achọpụta na-abụkarị nke adigboloja.

    Tokin adigboloja n'Etherscan

Conclusion

Ọ bụrụhaala na e nwere ihe nrita n'ụwa, a ga-enwe ndị adigboloja ndị na-anwa izu ohi maka onwe ha, ma n'ime ọnọdụ onye ọbụla nọọro onwe ya o nweghị onye ga-echebe gị ma e wezụga gị. E nwere olileanya na ị na-echeta ihe ndị a iji nyere tokin ziri ezi aka ka ọ ghara ịbanye n'aka ndị ojoro:

  • Tokin adigboloja na-eṅomị tokin ziri ezi, ha nwere ike iji otu aha, akara, wdg.
  • Tokin adigboloja enweghị ike iji otu adreesị nkwekọrịta.
  • Ebe kacha mma maka adreesị nke tokin ziri ezi bụ otu ụlọ ọrụ nwe tokin ahụ.
  • Ọ bụrụ na e meghị nke ahụ, i nwere ike iji ngwa a ma ama ma tụkwasị obi dịka Uniswap(opens in a new tab) na Etherscan(opens in a new tab).

Edemede a ọ nyere aka?