Mafee na isi ọdịnaya

Emelitere peeji ikpeazụ: 10 Ọktoba 2023

Otu e si emepe akaụntụ Ethereum

Onye ọbụla nwere ike imepe akaụntụ Ethereum n'oge ọbụla, n'efu. E nwere ụzọ dị iche iche, mana ụzọ kachasị mfe nakwa nke a na-ahụkarị bụ iji ngwa a maara dị ka akpa ego ịntanetị. Akpa ego ịntanetị na-emepụta ma na-echekwa ihe ndị na-enyere gị aka iji Ethereum. I nwere ike iji akpa ego ịntanetị gị mee azụmahịa, lelee nguzozi tokin gị ma jikọọ na ngwa sitere na Ethereum, dị ka ịgbanwe tokin, egwuregwu, ebe azụmaahịa NFT na ndị ọzọ. Ụfọdụ ngwa "web2" na-enyekwa gị ohere iji Ethereum banye.

N'adịghị ka imepe akaụntụ ọhụrụ n'ụlọ ọrụ, imepe akaụntụ Ethereum bụ n'efu, ọ bụkwa na nzuzo ma ọ naghịkwa achọ ikike. A na-eji igodo nke ngwanro akpa ego ịntanet gị na-enyere gị aka imepụta ejikwa akaụntụ, ọ bụghịkwa ndị ọzọ nyere ya, maọbụ chekwaa ya na ndekọ etiti.

Nzọụkwụ 1: Họrọ akpa ego ịntanetị

Akpa ego ịtanetị bụ akụrụngwa na-enyere gị aka ijikwa akaụntụ Ethereum gị. Ọ na-eji igodo gị na-ezipu ma na-anata azụmahịa wee na-abanye na ngwa. E nwere ọtụtụ akpa ego ịntanetị dị iche iche e nwere ike si na ya mee nhọrọ - mkpanaka, desktọpụ, maọbụ ọbụnadị ngwa nchọgharị pụrụ iche.

Chọta obere akpa

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ, ị nwere ike họrọ nzacha "Ọhụrụ na crypto" na "chọta akpa ego ịnteanetị" iji chọpụta akpa ego ịntanetị nke kwesiri ịgụnye njirimara niile dị mkpa maka ndị mbido.

nyochaa nhọrọ na peeji 'chọta akpa ego ịntanetị'

E nwekwara ihe nzacha profaịlụ ndị ọzọ iji gboo mkpa gị. Ndị a bụ ọmụmaatụ nke akpa ego ịntanetị ndị a na-ejikarị - i kwesiri ime nnyocha nke gị tupu ị tụkwasị obi na ngwanrọ ọbụla.

Nzọụkwụ 2: Budata ma wụnye ngwa akpa ego ịntanetị gị

Ozugbo i mere mkpebi n'akpa ego ịntanetị, gaa n'ebe weebụ ha maọbụ ụlọ ahịa ngwa, budata ma wụnye ya. Ha niile kwesiri ịbụ n'efu.

Nzọụkwụ 3: Mepee ngwa ahụ wee mepụta maọbụ webata akaụntụ Ethereum gị

Oge mbụ i mepere akpa ego ịntanetị ọhụrụ gị, e nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ n'etiti imepe akaụntụ ọhụrụ maọbụ iwebata nke dị adị. Pịa aka na mmepụta akaụntụ ọhụrụ.

Nzọụkwụ 4: Chekwaa nkebi ahịrịokwu mgbake gị

Ụfọdụ ngwa ga-achọ ka ị chekwaa 'mkpụrụ nkebi ahịrịokwu' nzuzo (i nwekwara ike ịhụ na a na-akpọ nke a "ahịrịokwu mgbake" maọbụ "mnemonic"). Idobe mkpụrụ nkebi ahịrịokwu a dị oke mkpa! A na-eji mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ ewepụta igodo nzuzo maka akaụntụ nke e nwere ike iji banye ma zipu azụmahịa. Onye ọbụla nke maara mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ nwere ike ị na-eji akaụntụ niile sitere na ya. Gị na onye ọbụla ekekọrịtakwala mkpụrụ nkebi ahịrịokwu. Mkpụrụ nkebi ahịrịokwu kwesiri inwe mkpụrụokwu 12 ruo 24 na-enweghị usoro (usoro okwu ndị ahụ dị mkpa).

Ozugbo i chekwachara mkpụrụ nkebi ahịrịokwu gị, ị ga-ahụ dashbọọdụ akpa ego ịntanetị gị na ego ole fọdụrụ. Lelee ntuziaka anyị: etu e si eji akpa ego ịntanetị.


Chọrọ ịmụtakwu?
Hụ ntuziaka anyị ndị ọzọ

Frequently asked questions

Akpa ego ịtanetị m na akaụntụ Ethereum m abụ otu?

No. Akpa ego ịntanetị bụ akụrụngwa njikwa na-enyere gị aka ijikwa akaụntụ. Otu akpa ego ịntanetị nwere ike inye ohere inweta ọtụtụ akaụntụ, ma otu akaụntụ nwere ike inwe ikike inwe ọtụtụ akpa ego ịntanetị. A na-eji mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ahụ mepụta akaụntụ nke akpa ego ịntanetị na-achịkwa.

I nwere ike iche echiche akaụntụ bụ akwụkwọ ndụ na-eto eto n'osisi site n'otu mkpụrụ nkebi ahịrịokwu. Mkpụrụ nkebi ahịrịokwu ọbụla pụrụ iche ga-eto ọtụtụ osisi akaụntụ dị iche iche.

Enwere m ike izipu bitcoin na adreesị Ethereum, maọbụ ether na adreesị Bitcoin?

Mba, i nweghị ike. Bitcoin na ether dị na netwọk abụọ dị iche iche (ya bụ, blọkchen dị iche iche), nke ọbụla nwere ụdị akwụkwọ ndekọ ha na usoro adreesị. E nweela mbọ dị iche iche a gbara iji mechie netwọk abụọ ahụ, nke bụ na nke kachasị arụ ọrụ ugbu a bụ bitcoin E Kedoro ekedo maọbụ WBTC(opens in a new tab). Nke a abụghị nkwado, n'ihi na WBTC bụ usoro nchekwa (nke pụtara otu ìgwè mmadụ na-achịkwa ụfọdụ ọrụ dị oke mkpa) ma e wetara ya ebe a naanị maka ozi.

Ọ bụrụ na m nwere adreesị ETH, enwere m otu adreesị na blọkchen ndị ọzọ?

I nwere ike iji otu adreesị ahụ na blọkchen niile na-eji sọftụwia dabara adaba n'Ethereum (nke a maara dị ka 'EVM-compatible'). Ndeputa a(opens in a new tab) ga-egosi gị blọkchen nke i nwere ike ị na-ejikọta ya na otu adreesị ahụ. Ụfọdụ blọkchen, dị ka Bitcoin, na-emejuputa usoro iwu netwọk dị iche iche ma ị ga-achọ adreesị dị iche nakwa usoro dị iche. Ọ bụrụ na i nwere ngwa akpa ego ịntanetị i kwesiri ịlele webụsaịtị ngwaahịa ya maka ozi ndị ọzọ na-akwado blọkchen.

Inwe akpa ego ịntanetị m ọ dị mma karịa idobe ego m na mgbanwe?

Inwe akpa ego ịntanetị gị pụtara na ị na-ahụ maka nchekwa nke akụ gị. Ọ dị nwute na e nwere ọtụtụ ihe atụ nke mgbanwe na-agaghị nke ọma nke tụfuru ego ndị ahịa ha. Inwe akpa ego ịntanetị (ya na mkpụrụ nkebi ahịrịokwu) na-ewepụ ihe egwu metụtara ntụkwasị obi ụfọdụ ụlọ ọrụ ijide akụ gị. Agbanyeghị, ị ga-edobe igodo nke gị wee zeere ojoro ịntanetị, ịkwado azụmahịa na mberede maọbụ ikpughe igodo, imekọrịta weebụsaịtị adịgboroja yana ihe egwu njide onwe ndị ọzọ. Ihe ize ndụ na ihe nrita dị iche.

Ọ bụrụ na m tufuo ekwentị m/haadịwịe, ọ dị m mkpa iji otu ngwa akpa ego ịntanetị ahụ nwetaghachie ego m furu efu ọzọ?

Mba, i nwere ike iji akpa ego ịntanet dị iche. Ọ bụrụhalaa na i nwere mkpụrụ nkebi ahịrịokwu i nwere ike tinye ya n'ime ọtụtụ akpa ego ịntanetị ma ha ga-eweghachi akaụntụ gị. Kpachara anya ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ime nke a: ọ kacha mma ijide n'aka na i jikọghị n'ịntanetị mgbe ị na-eweghachi akpa ego ịntanetị gị ka mkpụrụ nkebi ahịrịokwu gị ghara ịgbapụta na mberede. Ọ naghị ekwe omume inwetaghachi ego furu efu na-enweghị mkpụrụ nkebi ahịrịokwu.

Edemede a ọ nyere aka?