Mafee na isi ọdịnaya

Emelitere peeji ikpeazụ: 10 Ọktoba 2023

Uzo esi agbanwe tokens

Ike agwụla gị n'ịchọ mgbanwe na-edepụta tokin ọkacha mmasị gị niile? I nwere ike ịgbanwe ọtụtụ n'ime tokin site na iji mgbanwe enweghị isi.

Ngbanwe tokin na-agụnye mgbanwe nke akụ abụọ dị iche iche dị na netwọk Ethereum, iji maa atụ ịgbanwere ETH maka DAI (tokin ERC-20). Usoro a dị ọnụ ala ma dịkwa ngwa ngwa. Ị ga-ewe obere akpa ego ịntanetị crypto iji gbanwee tokin.

Ihe a chọrọ:

  • nwere akpa ego ịntanetị crypto, i nwere ike soro nkuzi a: Etu e si eme: "Debanye aha" akaụntụ Ethereum
  • tinye ego na akpa ego ịntanetị gị

Otu. Jikọọ akpa ego ịntanetị gị na mgbanwe dịịrị onwe ya (DEX) nke nhọrọ gị

Ụfọdụ ebe mgbanwe ndị a ma ama bụ:

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụtakwu banyere ihe DeFi bụ nakwa etu ụdị mgbanwe ọhụrụ a sị arụ ọrụ, any nwere ike ị tụrụ gị aka n' Ọba Akwụkwọ Kernel(opens in a new tab).

abuo. Họrọ ụzọ tokin nke ị chọrọ ịgbanwe

Iji maa atụ, ETH na DAI. Gbaa mbọ hụ na i nwere ego n'otu n'ime akpa ego ịntanetị abụọ ahụ. Ihe ebe njikọ maka mgbanwe

Ato. Tinye ego nke tokin ị chọrọ ịzụ ahịa ya wee pịa aka na ngbanwe

Ebe ngbanwe ahụ ga-agbakọ tokin ole ị ga-enweta ozugbo.

Ihe ebe njikọ maka mgbanwe

4. Kwado azụmahịa ahụ

Nyochaa nkọwa nke azụmahịa ahụ. Lelee ọnụego mgbanwe na ụgwọ ọzọ ọbụla maka iji gbochie ihe ịtụnanya nke jọgburu onwe ya.

Ebe njikọ maka nnyochaa azụmahịa

5. Chere ka a hazie azụmahịa ahụ

I nwere ike ịlele ọganihu nke azụmahịa ahụ n'ihe nchọgharị blọkchen ọbụla. Usoro a ekwesịghị iwe ihe karịrị nkeji 10.

Ị ga-enweta tokin nke a gbanwere n'akpa ego ịntanetị gị ozugbo e mechara azụmahịa ahụ.


Chọrọ ịmụtakwu?
Hụ ntuziaka anyị ndị ọzọ

Frequently asked questions

Enwere m ike ịgbanwe ETH maka BTC n'akpa ego ịntanetị m?

Mba, i nwere ike ịgbanwe naanị akpa ego ịntanetị nke sitere na netwọk Ethereum, dị ka ETH, tokin ERC-20 maọbụ NFT. I nwere ike ịgbanwe naanị ụdị fọm "e kedoro" nke Bitcoin dị n'Ethereum.

Kedu ihe bụ slịpeeji?

Ọ bụ ihe dị iche n'etiti ọnụego mgbanwe gị na-atụ anya na ihe ọnụego nyere.

Edemede a ọ nyere aka?