Mafee na isi ọdịnaya

Emelitere peeji ikpeazụ: 10 Ọktoba 2023

Uzo esi ejikọta tokens na layer 2

Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ azụmahịa n'Ethereum, o nwere ike ịdị ọnụ. Otu usoro maka nke a bụ imepụta "ebe nhazi" ọhụrụ: ya bụ netwọk dị iche iche nke na-arụ ọrụ n'ụzọ yiri nke Ethereum n'onwe ya. Ihe ndị a na-akpọ Ebe Nhazi 2 na-enye aka belata nchịkọta na ọnụ ahịa Ethereum site n'ịhazi ọtụtụ azụmahịa ndị ọzọ na ụgwọ dị ala, na-echekwa naanị nsonaazụ nke ndị a n'Ethereum kwa mgbe. Ka ọ dị etu a, ndị ebe nhazi 2 na-enyere anyị aka ịzụ ahịa ngwa ngwa ma belatakwa ụgwọ. Ọtụtụ ọrụ crypto na-ewu ewu na-aga n'ebe nhazi 2 n'ihi uru ndị a. Ụzọ kachasị mfe iji bufee tokin site na Ethereum gaa n'ebe nhazi 2 bụ iji briiji.

Ihe a chọrọ:

  • nwere akpa ego ịntanetị crypto, i nwere ike soro nkuzi a: Etu e si eme: "Debanye aha" akaụntụ Ethereum
  • tinye ego na akpa ego ịntanetị gị

Otu. Kpebie ebe netwọk nhazi 2 ị chọrọ iji

I nwere ike ịmụtakwu banyere ngwa kọmputa dị iche iche na njikọ dị mkpa na peeji ebe nhazi 2.

abuo. Gaa na briiji nke a họpụtara

Ụfọdụ ebe nhazi 2 na ewu ewu bụ:

Ato. Jikọọ akpa ego ịntanetị gị na briiji

Jide n'aka na e jikọrọ akpa ego ịntanetị gị na netwọk Ethereum Mainnet. Ọ bụrụ na ọ bụghị, webụsaịtị ahụ ga-akpali gị ozugbo ka ịgbanwee netwọkụ.

Ihe njikọ ọnụ maka tokin briiji

4. Kọwaa ego ole ọ bụ ma bugharịa ego ahụ

Nyochaa ego ị ga-enweta na nkwụghachi na netwọkụ ebe nhazi 2 yana ụgwọ iji zeere ihe ịtụnanya na-adịghị mma.

Ihe njikọ ọnụ maka tokin briiji

5. Kwadoo azụmahịa nke ahụ n'akpa ego ịntanetị gị

Ị ga-akwụ ụgwọ n'ụdị ETH maka nhazi nke azụmahịa ahụ.

Ihe njikọ ọnụ maka tokin briiji

6. Chere ka e bufee ego gị

Usoro a e kwesịghị iwe ihe karịrị nkeji 10.

7. Tinye netwọk ebe nhazi 2 a họpụtara n'akpa ego ịntanetị (nhọrọ)

Ị nwere ike jiri chainlist.org(opens in a new tab) ịji chọta ozi ndị dị na nkọwa RPC. Ozugbo a etinyechara netwọk ahụ wee mechaa azụmahịa, ị ga-ahụ tokin na akpa ego ịntanetị gị.


Chọrọ ịmụtakwu?
Hụ ntuziaka anyị ndị ọzọ

Frequently asked questions

Ọ bụrụkwanụ na m nwere ego na ebe mgbanwe?

I nwere ike ị wepụ ego n'ebe nhazi 2 oyi site na mgbanwe. Lelee nkeji "Gaa n'ebe nhazi 2" nke peeji ebe nhazi 2 maka ozi ndị ọzọ.

Enwere m ike ịlaghachi azụ na Ethereum mainnet mgbe m jikọtachara tokin m na L2?

Ee, i nwekwara ike ibugharị ego gị na mainnet site na iji otu briiji ahụ.

Edemede a ọ nyere aka?